4 Mu onwem siri, Jehova, merem amara:Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.
5 Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si.Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?
6 Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu;Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe:Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.
7 Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem:N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.
8 Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru:E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.
9 Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim,Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.
10 Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie,Ka m'we kwughachi ha ugwọ.