1 Dika agu iyi miri si agu nne-ele,Otú a ka agu Gi nāgu nkpuru-obim, Chineke.
2 Akpiri Chineke, bú Chineke di ndu, akpọwo nkpuru-obim nku:Òle mb͕e m'gābia, ewe hum n'iru Chineke?
3 Anya-mirim aghọworom nri ehihie na abali,Mb͕e ha nāsim ogologo ubọchi nile, Òle ebe Chineke-gi nọ?
4 Ihe ndia ka m'gēcheta, wusi kwa nkpu tu-obim nimem dika miri,Otú m'nāgabiga n'etiti ìgwè madu, nējere ha nwayọ dika onye-ndú-ha rue ulo Chineke,N'olu iti-nkpu-ọṅù na nke ekele, bú ìgwè madu nēme ememe.
5 Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim?Gini mere i ji su ude nke-uku nimem?Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọN'ihi nzọputa nile nke iru-Ya.