1 Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere:Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu.
2 N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n'ìhi gini ka I juworom aju?N'ihi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro?
3 Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi; ka ha onwe-ha nēdum:Ka ha me ka m'biarue ugwu nsọ Gi,Biaru kwa ebe-obibi-Gi nile.
4 M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke,Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm:M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem.