15 Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum,Ihere irum ekpuchiwokwam,
16 N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu;N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.
17 Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi,Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi
18 Obi-ayi alaghachighi azu,Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;
19 Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia,Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.
20 Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;
21 Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.