18 Obi-ayi alaghachighi azu,Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;
19 Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia,Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.
20 Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;
21 Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.
22 N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile;Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.
23 Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi?Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.
24 N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi?N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi?