1 Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova,Ghọta ntughari-uchem.
2 Ṅa nti n'olu ntiku m'nētiku Gi, Ezem, na Chinekem:N'ihi na ọ bu Gi ka m'nēkpere.
3 Jehova, n'ututu ka I gānu olum;N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.
4 N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu:Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ.
5 Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi:I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.
6 I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì:Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.
7 Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi:M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi.