15 Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
16 Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?
17 Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.
18 Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
19 I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.
20 I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.
21 Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;I chère na adizum ka i di:M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.