6 Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha:Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.
7 Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya:Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.
8 Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze,Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.
9 Tutu ite-unu amata ọku ogwu,Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.
10 Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu:Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.