1 Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi,Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2 Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu:Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.
3 Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?
4 Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:Zọputam n'ihi ebere-Gi.
5 N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu:Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?
6 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem;Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim;Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.
7 Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.