1 Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion:Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.
2 Gi Onye nānu ekpere,Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.
3 Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike:Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.
4 Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa,Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso,Ka o we biri n'ogige-Gi nile:Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi,Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.
5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume,Chineke nke nzọputa-ayi;Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya: