1 Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:
2 Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma:Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.
3 Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.
4 Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,Bùku kwa Gi abù ọma;Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah
5 Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.
6 Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.
7 O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;Anya-Ya abua nēche mba nile nche:Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah