12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;Ayi bàra n'ọku na nime miri;I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
13 M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,
14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.
15 Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi,Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu;M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah
16 Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke,M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.
17 Ya ka m'jiri ọnum kpọkue,Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.
18 Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim,Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum: