31 Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta;Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.
32 Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah
33 Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.
34 Nyenu Chineke ike:N'elu Israel ka idi-elu-Ya di,Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile.