5 Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru,Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ.
6 Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo:Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma:Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.
7 Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi,Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah
8 Ala mara jijiji,Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke:Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.
9 Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke,Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.
10 Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.
11 Onye-nwe-ayi nēnye okwu:Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.