17 Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.
18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:N'ihi ndi-irom b͕aputam.
19 Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.
20 Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula;M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.
21 Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.
22 Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.
23 Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.