10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:Mba nile gēfè ya òfùfè.
12 N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.
14 Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha;Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.
15 Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba:Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile;Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.
16 Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile;Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.