16 Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile;Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon:Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.
17 Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi;N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù:Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya:Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.
18 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke, bu, bú Chineke nke Israel,Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:
19 Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi;Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.Amen, na Amen.