26 O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
27 O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
28 O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29 Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30 Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32 N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.