28 O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29 Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30 Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32 N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
33 O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume,O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
34 Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.