31 Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32 N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
33 O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume,O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
34 Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
35 Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
36 Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37 Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.