8 I si n'Ijipt ropu osisi vine:I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.
9 I doziri ọnọdu n'iru ya,O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.
10 Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.
11 Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.
12 N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?
13 Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.
14 Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,