3 Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi:Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.
4 Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu:Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.
5 Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa;N'ọchichiri ka ha nējeghari:Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.
6 Mu onwem siri, Chi ka unu bu,Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.
7 Otú ọ di, dika madu ka unu gānwu,Ọ bu kwa dika otù nime ndi-isi ka unu gādà.