4 Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.
5 I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali,Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;
6 Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri,Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.
7 Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi;Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi;Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.
8 Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.
9 N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;
10 Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.