1 Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele,Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:
2 Igosi ebere-Gi n'ututu,Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali,
3 Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une;Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.
4 N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova:Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù.