5 Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.
6 Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.
7 Ha we si, Ja agaghi-ahu,Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.
8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?
9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?
10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?
11 Jehova mara èchìchè madu,Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.