7 Ha we si, Ja agaghi-ahu,Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.
8 Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?
9 Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?
10 Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?
11 Jehova mara èchìchè madu,Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.
12 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;
13 Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ,Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.