3 N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu,Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile.
4 Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya:Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya.
5 Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya;Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.
6 Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala;Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi:
7 N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi:Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya.Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya,
8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba,Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:
9 Mb͕e nna-unu-hà nwaram,Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.