8 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.
9 Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ:Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.
10 Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.
11 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;
12 Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya;Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;