5 Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova,N'iru Onye-nwe uwa nile.
6 Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.
7 Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche:Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.
8 Zaion nuru, we ṅuria,Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.
9 N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile:Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.
10 Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì:Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.
11 Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru,Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.