4 N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum:Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah
5 Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile;Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah
6 N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.
7 Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu;Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah
8 M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya:M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.
9 Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.
10 Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.