3 Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.
4 Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.
5 Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.
6 Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.
7 N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.
8 Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
9 Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.