8 Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
9 Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.
10 Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.
11 Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.
12 Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.
13 Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;Ekperem nālaghachikute kwa obim.
14 Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.