2 Gi Onye nānu ekpere,Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.
3 Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike:Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.
4 Ihe nāgara ya nke-ọma, bú onye I nārọputa,Onye I nēme kwa ka ọ biarue nso,Ka o we biri n'ogige-Gi nile:Ka afọ ju ayi n'ezi ihe nke ulo-Gi,Bú ebe nsọ nke ulo uku Gi.
5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume,Chineke nke nzọputa-ayi;Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:
6 Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike;Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:
7 Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha,Ya na ùzù nke mba nile.
8 Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi:I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.