8 Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:
9 Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.
10 N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.
11 I mere ka ayi ma n'ọnyà;I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.
12 I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;Ayi bàra n'ọku na nime miri;I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
13 M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,
14 Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.