28 Chineke-gi enyewo ike-gi iwu:Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu.
29 N'ihi ulo uku Gi nime JerusalemỌ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú.
30 Basiere anu-ọhia nke amì nba ike,Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche,Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha;Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ.
31 Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta;Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.
32 Unu ala-eze nke uwa, bùkuenu Chineke abù;Bùkuenu Onye-nwe-ayi abù ọma; Selah
33 Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya;Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.
34 Nyenu Chineke ike:N'elu Israel ka idi-elu-Ya di,Ike-ya di kwa na mbara-ígwé nile.