1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike:N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.
2 Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa;Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.
3 Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike:Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya.
4 Mu onwem siri, Jehova, merem amara:Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.
5 Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si.Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?
6 Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu;Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe:Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.
7 Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem:N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.