5 Ihe di egwu ka I nēji za ayi n'ezi omume,Chineke nke nzọputa-ayi;Gi Onye bu ihe-ntukwasi-obi nke nsọtu nile nke uwa,Na nke oké osimiri, bú ebe di iche iche di anya:
6 Onye nēji ike-Ya me ka ugwu nile guzosie ike;Ebe ewerewo idi-ike ke Ya n'úkwù:
7 Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha,Ya na ùzù nke mba nile.
8 Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi:I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.
9 I letawo ala, we me ka o juputa n'ihe,I nēme ka ọ nwe àkù ri nne;Miri-iyi Chineke juputara na miriI nēdozi ọka-ha, mb͕e I si otú a dozie ala onwe-ya.
10 I nēdè ọ̀b͕à-ala-ubi-ya miri:I nēme ka ebe elu ya nile di lari:I nēji oké miri-ozuzo b͕aze ya;I nāgọzi ihe-opupú-ya.
11 I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze;Uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba.